Subscribe in a reader

Sunday, 27 August 2017

Nnamdi Ewenighi – Pharaoh


Pharaoh rapu ndim Ka ha laa
Pharaoh rapu ndim ka ha laa
Ejim obara kwu ugwo njo…
Pharaoh rapu ndim ka ha laa…
Pharaoh rapu ndim
Ka ha laa, ka ha laa
Pharaoh rapu ndim ka ha laa
Ejim obara kwu ugwo njo oor…
Pharaoh rapu ndim ka ha laa

Egwu a bu etu umu Israel
Si wee si n’ala Egypt wey puta
Chineke wee nye ha mmeri
Haa wee buo abuoma wee laa
Site n’ala Egypt

Pharaoh rapu ndim
Ka ha laa, ka ha laa
Pharaoh rapu ndim ka ha laa
Ejim obara kwu ugwo njo oor…
Pharaoh rapu ndim ka ha laa
Pharaoh rapu ndim
Ka ha laa, ka ha laa
Pharaoh rapu ndim ka ha laa
Ejim obara kwu ugwo njo oor…
Pharaoh rapu ndim ka ha laa

Umu Chineke gara obodo ndolo na gha
Ewee kuo haa isi abaa okpu
Ebe ahu ka ha noro otutu aro haa
Umu Chineke gara obodo ndolo na gha
Ewee kuo haa isi abaa okpu
Ebe ahu ka ha noro otutu aro haa
Odighi onye choro ikwuru ha onu
Odighi onye nuru akwa haa n’ebe
Ewee n’eme ha ihe ana eme ozu nwuru anwu
Odighi onye choro ikwuru ha onu
Okacha eweem iwe
Odighi onye nuru akwa ha n’ebe
Ewee n’eme ha ihe ana eme ozu nwuru anwu
Chineke ke eligwe lee chara ha (lee chara ha)
Lee chara ha nye ha ezi nkwado
Moses gwaram Pharaoh okwu oooh…
Pharaoh rapu ndim ka ha laa
Jehovah ke eligwe lee chara ha (lee chara haa)
Lee chara ha nye ha ezi nkwado
Moses gwaram Pharaoh okwu oooh…
See Pharaoh rapu ndim ka ha laa

Ekwu ekwu bu ihe mere onu n’elu uwa
Anu anu bu ihe mere nti dooo
Egburu isi n’uwa nti esoro
Egburu kwa nke gi akam adighi ya
Ekwu ekwu bu ihe mere onu n’elu uwa
Anu anu bu ihe mere nti dooo
Egburu isi n’uwa nti esoro
Egburu kwa nke gi akam adighi ya
N’ihi na ihe oma ahu Chineke
Malitere ka omewe
Ajuo madu apuhi igbochi ya
Eme elu mee ala esiteru ya na onwu
Eme elu mee ala awataru ya na anya
N’ihi na ihe oma ahu Chineke
Malitere ka omewe
Ajuo madu apuhi igbochi ya
Eme elu mee ala esiteru ya na onwu

Eme elu mee ala awataru ya na anya

No comments:

Post a Comment